EMOS 1:1-2
EMOS 1:1-2 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị. Ọ sịrị, ONYENWE ANYị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ, o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda. Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ. Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.
EMOS 1:1-2 Bible Nso (IGBOB)
Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji. Ọ we si, Jehova gēsi na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; ebe-ita-nri nile nke ndi-ọzùzù-aturu ewe ru újú, elu Kamel gākpọnwu kwa.