Mafee gaa na ọdịnaya

ỌLU NDI-OZI 8:4-36 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌLU NDI-OZI 8:4-36 IGBOB (Bible Nso)

Ya mere ndi b͕asara jeghariri nēzisa ozi ọma, bú okwu Chineke. Filip we rida n'obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi. Ìgwè madu nile we were otù obi nāṅa nti ihe nile Filip nēkwu, mb͕e ha nuru, hu kwa ihe-iriba-ama ọ nēme. N'ihi na site n'aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ. Oké ọṅù we di n'obodo ahu. Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku: onye ha nile, site n'onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku. Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya. Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom. Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n'ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n'aru. Ma mb͕e ndi-ozi ndi nọ na Jerusalem nuru na Sameria anarawori okwu Chineke nke-ọma, ha zigara ha Pita na Jọn: ndi, mb͕e ha ridatara, ha kpere ekpere bayere ha, ka ha we nara Mọ Nsọ: n'ihi na ọ kādakwasighi n'isi onye ọ bula n'etiti ha: ọ bu nání na emere ha-ri baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus. Mb͕e ahu ha bikwasiri ha aka-ha n'isi, ha we nara Mọ Nsọ. Ma mb͕e Saimon huru na anēnye Mọ Nsọ site n'ibikwasi aka nke ndi-ozi, o chere ego n'iru ha, si, Nye-kwa-num ike a, ka, onye ọ bula m'gēbikwasi akam abua n'isi, ka o we nara Mọ Nsọ. Ma Pita siri ya, Ka ọla-ọcha-gi so gi la n'iyì, n'ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n'ego. I nweghi òkè ma-ọbu ihe-nketa n'okwu a: n'ihi na obi-gi ezighi ezi n'iru Chineke. Ya mere chègharia n'obi ọjọ gi a, riọ Onye-nwe-ayi, ma eleghi anya agāb͕aghara gi èchìchè obi-gi. N'ihi na ahurum na i nọ n'òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume. Saimon we za, si, Unu onwe-unu riọrọm Onye-nwe-ayi, ka ihe ọ bula nime ihe unu kwuworo ghara ibiakwasim. Ya mere, mb͕e ha dusiri ọdu kwu kwa okwu Onye-nwe-ayi, ha laghachiri na Jerusalem, nēzisa kwa ozi ọma nye ọtutu obodo ntà ndi Sameria. Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi gwara Filip okwu, si, Bilie, nāga n'akuku Ndida rue uzọ nke si na Jerusalem arida rue na Geza: uzọ ahu bu ọhia. O we bilie ga: ma le, otù nwoke nke Etiopia, bú onozi nke di ike nke-uku n'okpuru Kandesi, eze-nwanyi ndi Etiopia, onye emere onye-isi àkù-ya nile, onye biarari na Jerusalem ikpọ isi ala nye Chineke; o we nālaghachi, nānọdu kwa n'ub͕ọ-ya, nāgu kwa akwukwọ Aisaia onye-amuma. Mọ Nsọ we si Filip, Jekuru ub͕ọ-ala ahu, nọnyaba kwa ya nso. Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu? Ọ si, É-è, n'ihi na #m'gēsi aṅa pu imata, ma ọ buru na ọ dighi onye gēdum? O we riọ Filip ka ọ rigota, ka ya na ya nọdu. Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka, Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u; Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji, Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya: Ewepuru ikpé-Ya nime ọnọdu-Ya di ala: Ònye gākọ ọb͕ọ Ya? N'ihi na anēwepu ndu-Ya n'uwa. Onozi ahu we za Filip, si, Ariọm i, ònye ka onye-amuma nka nēkwu okwu a bayere? ọ̀ bu ya onwe-ya ma-ọbu onye ọzọ di iche? Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n'ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ. Ma mb͕e ha nāga n'uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism?

ỌLU NDI-OZI 8:4-36 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ndị ahụ a chụsasịrị zisara oziọma nʼebe niile ha gbagara. Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst. Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ. Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ. Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ. Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu. Onye ọbụla, ma onye ukwu ma onye nta, na-ege ya ntị na-asịkwa “Nwoke a bụ ike Chineke ahụ a na-akpọ Ike dị ukwuu.” Ha na-ege ya ntị oge niile nʼihi na ọ na-eji ike mgbaasị ya na-eme ihe juru ha anya. Ma mgbe ha kwenyere nʼoziọma Filip dịka ọ na-ekwusa ihe banyere oziọma alaeze Chineke na aha Jisọs Kraịst, e mere ha baptizim, ma nwoke ma nwanyị ha. Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu. Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu nke Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn. Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ. Nʼihi na Mmụọ Nsọ abịakwasịbeghị onye ọbụla nʼime ha, kama ihe e mere ha bụ baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs. Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Mgbe Saimọn hụrụ na a na-enye Mmụọ Nsọ naanị site nʼaka ndị ozi bikwasịrị ha nʼisi, o chere ha ego nʼihu, sị, “nyekwanụ m ike a. Ka onye ọbụla m bikwasịrị aka nʼisi nata Mmụọ Nsọ.” Ma Pita sịrị, “Gị na ego gị laakwa nʼiyi. Nʼihi na i chere na ị ga-eji ego zụta onyinye Chineke. I nweghị oke maọbụ ihe nketa nʼọrụ a, nʼihi na obi gị ezighị ezi nʼihu Chineke. Si nʼajọ omume gị chegharịa, rịọ Onyenwe anyị arịrịọ ma eleghị anya ọ ga-agbaghara gị echiche ọjọọ niile nke obi gị. Nʼihi na ahụrụ m na ị jupụtara nʼobi ilu na ị nọkwa nʼagbụ nke ajọ omume.” Saimọn zara Pita sị, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a niile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.” Mgbe ha gbachara akaebe, ma kwusaakwa okwu nke Onyenwe anyị, ha lọghachiri Jerusalem. Ma mgbe ha na-ala ha zisara oziọma nʼọtụtụ obodo ndị Sameria. Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip sị, “Gaa na ndịda, nʼụzọ ọzara nke siri Jerusalem gawa Gaza, ụzọ ahụ bụ ụzọ ọzara.” O biliri gawa. Mgbe ahụ, otu onye Itiopia bụ onye onozi, bụrụkwa onyeisi ozi dị mkpa, onye na-eche akụ nke Kandis, eze nwanyị ndị Itiopia, gara Jerusalem ife Chineke. Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nʼụgbọala ya, nke ịnyịnya na-adọkpụgharị, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.” Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?” Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya. Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya. Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị, otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya. Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya? Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.” Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?” Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, “Lee, nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?”