Mafee gaa na ọdịnaya

ỌLU NDI-OZI 8:26-31 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌLU NDI-OZI 8:26-31 IGBOB (Bible Nso)

Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi gwara Filip okwu, si, Bilie, nāga n'akuku Ndida rue uzọ nke si na Jerusalem arida rue na Geza: uzọ ahu bu ọhia. O we bilie ga: ma le, otù nwoke nke Etiopia, bú onozi nke di ike nke-uku n'okpuru Kandesi, eze-nwanyi ndi Etiopia, onye emere onye-isi àkù-ya nile, onye biarari na Jerusalem ikpọ isi ala nye Chineke; o we nālaghachi, nānọdu kwa n'ub͕ọ-ya, nāgu kwa akwukwọ Aisaia onye-amuma. Mọ Nsọ we si Filip, Jekuru ub͕ọ-ala ahu, nọnyaba kwa ya nso. Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu? Ọ si, É-è, n'ihi na #m'gēsi aṅa pu imata, ma ọ buru na ọ dighi onye gēdum? O we riọ Filip ka ọ rigota, ka ya na ya nọdu.

ỌLU NDI-OZI 8:26-31 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip sị, “Gaa na ndịda, nʼụzọ ọzara nke siri Jerusalem gawa Gaza, ụzọ ahụ bụ ụzọ ọzara.” O biliri gawa. Mgbe ahụ, otu onye Itiopia bụ onye onozi, bụrụkwa onyeisi ozi dị mkpa, onye na-eche akụ nke Kandis, eze nwanyị ndị Itiopia, gara Jerusalem ife Chineke. Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nʼụgbọala ya, nke ịnyịnya na-adọkpụgharị, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.” Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?” Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya.