Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 4:7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌLU NDI-OZI 4:7 IGBOB (Bible Nso)

Mb͕e ha guzosiri ha n'etiti, ha jua ha, si, N'àha ike gini, ma-ọbu n'aha gini, ka unu onwe-unu mere nka?

ỌLU NDI-OZI 4:7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?”