ỌLU NDI-OZI 4:1-2 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌLU NDI-OZI 4:1-2 IGBOB (Bible Nso)
Ma mb͕e ha nāgwa ndi-Ju okwu, ndi-nchu-àjà na ọchi-agha nke ulo uku Chineke na ndi-Sadusi biakwasiri ha, ebe ike gwuru ha nọ̄ n'ihi na ha nēzi ndi-Ju ihe, nēkuwsa kwa nime Jisus nbilite site na ndi nwuru anwu.
ỌLU NDI-OZI 4:1-2 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha. Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị.