Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 3:1-16

ỌLU NDI-OZI 3:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie. Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma. Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ. Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.” O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye. Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.” O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike. Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke. Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke, ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya. Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn. Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije? Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa. Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ. Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a. Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.

ỌLU NDI-OZI 3:1-16 Bible Nso (IGBOB)

Ma Pita na Jọn nārigo n'ulo uku Chineke n'oge hour ekpere, bù oge hour nke-iteghete. Anēbute kwa otù nwoke nke dara ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ha nātọb͕ọ kwa-ubọchi na nso ọnu-uzọ ahu nke ulo uku Chineke nke anākpọ Ọnu-uzọ Ọma, iriọ onyinye-ebere n'aka ndi nābà nime ulo uku Chineke; onye, mb͕e ọ huru Pita na Jọn ka ha gaje ibà n'ulo uku Chineke, ọ kpe ekpere inata onyinye-ebere. Ma Pita, ka ya na Jọn nēlegide ya anya, ọ si, Le ayi anya. O we riba ha ama, nēle anya inata ihe n'aka-ha. Ma Pita siri, Ọ dighi ọla-ọcha na ọla-edo m'nwere; ma ihe m'nwere, nke ahu ka m'nēnye gi. N'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, je ije. O we jide ya n'aka-nri, palie ya: ngwa ngwa ukwu-ya abua na nkwonkwo-ukwu-ya we nwe ume. O we wulie elu, guzo, je kwa ije; o we so ha ba n'ulo uku Chineke, nēje ije, nāwuli kwa, nēto kwa Chineke. Ndi-Ju nile we hu ya ka ọ nēje ije nēto kwa Chineke; ha we mata ya, na ọ bu onye ahu nke nọduru n'Ọnu-uzọ-ama Ọma nke ulo uku Chineke inata onyinye-ebere: o we b͕a ha ghari nke-uku, ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, n'ihi ihe emeworo ya-ri. Ma mb͕e o nējide Pita na Jọn aka, ndi-Ju nile b͕akọrọ n'ebe ha nọ n'ìbà nke anākprọ ìbà Solomon, ibobo nwuru ha n'aru nke-uku. Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n'ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije? Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya. Ma unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ob͕u-madu, unu we b͕ue Onye ahu nke nēdubà madu na ndu; Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; Onye ayi onwe-ayi bu ndi-àmà-Ya. Site kwa n'okwukwe ekwere n'aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n'aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n'iru unu nile.