ỌLU NDI-OZI 28:1-14
ỌLU NDI-OZI 28:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe a pụtara nʼọnụ mmiri ahụ nʼudo, anyị chọpụtara na aha agwa etiti ahụ bụ Malta. Ndị obodo ahụ gosiri anyị obiọma nʼụzọ pụrụ iche. Ha kwanyere anyị ọkụ ma nabatakwa anyị nʼihi na mmiri nọ na-ezo, oyi na-atụkwa. Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya. Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.” Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya. Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi. Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pobilios otu nwoke onyeisi na-achị agwa etiti ahụ. Ọ nabatara anyị nke ọma, lee anyị ọbịa ụbọchị atọ. Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma. Mgbe nke a mechara, ndị niile nwere nrịa nrịa nʼagwa etiti ahụ bịakwara, a gwọkwara ha. Ha wetaara anyị ọtụtụ ihe onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nʼije ahụ. Anyị nọrọ ihe dịka ọnwa atọ nʼoge oyi, nʼagwa etiti ahụ tutu anyị anyalie ụgbọ. Ọ bụ ụgbọ ndị Alegzandria nke bu ihe a tụrụ atụ a na-akpọ ejima, bụ chi Kastọ na Polụkus. Anyị bịaruru obodo Sirakọs ebe anyị nọrọ ụbọchị atọ. Site nʼebe ahụ, anyị gara gburugburu tutu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere, ikuku bidoro ife site na ndịda. Nʼụbọchị nke abụọ ya, anyị rutere Pọteọlị. Nʼebe a anyị chọpụtara ndị kwere ekwe ndị rịọrọ ka anyị nọnyere ha ụbọchị asaa. Site nʼebe a, anyị rutere Rom.
ỌLU NDI-OZI 28:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e azọputasiri ayi, mb͕e ahu ayi matara na anākpọ agwe-etiti ahu Melita. Ndi bi n'ebe ahu, bú ndi nāsu asusu ọzọ, we were obi-ọma mezie ayi n'uzọ anāhughi mb͕e ọ bula: n'ihi na ha funwuru ọku, kpọbata ayi nile, n'ihi miri nke nēzo n'oge ahu, na n'ihi oyi. Ma mb͕e Pọl chikọtasiri ùkwù nkù, tukwasi ha n'ọku, aju-ala we si n'okpom-ọku ahu puta, ta ya alu kokwasi kwa ya n'aka. Mb͕e ndi ahu ndi nāsu asusu ọzọ huru anu-ọhia ahu ka o kokwasiri ya n'aka, ha we sirita ibe-ha, N'ezie nwoke a bu ob͕u-madu, onye ọ bu ezie na azọputara ya n'oké osimiri, ma Ikpé ziri ezi ekweghi ka ọ di ndu. Otú ọ di, o febàra anu-ọhia ahu nime ọku, ma ọ dighi ihe ọjọ meruru ya aru. Ma ha nēle anya na ọ gaje iza, ma-ọbu ida n'ala nwua na mberede: ma mb͕e ha nēle anya ogologo oge, ma ha ahughi ihe ọ bula jọrọ njọ mere ya, ha we chègharia uche-ha, si na ọ bu chi. Ma n'ala di ab͕ata ebe ahu onye-isi agwe-etiti ahu, aha-ya bu Pọbliọs, nwere iberibe ala ufọdu; onye nara ayi nke-ọma, were kwa obi-ọma le ayi ọbìa ubọchi atọ. O we rue, na nna Pọbliọs nēdina, aru-ọku na ọnyunyu-ọbara jidesiri ya ike: onye Pọl bakutere, we kpe ekpere, bikwasi ya aka abua me ka aru di ya ike. Mb͕e emere nka, ndi fọduru n'agwe-etiti ahu ndi nāria nriaria we biakute ya, ewe me ka aru-ha di ike: ha we were kwa ọtutu nsọpuru sọpuru ayi; mb͕e ayi nupuru ub͕ọ, ha we tiye n'ub͕ọ ihe nile di ayi nkpà. Mb͕e ọnwa atọ gasiri ayi we ba n'ub͕ọ Aleksandria nupu, bú ub͕ọ nke nọgidereri n'agwe-etiti ahu na mb͕e oyi, nke ihe-iriba-ama-ya bu, Umu-nne-ndikom abua amuru n'otù mb͕e. Ayi we rue ala na Sairakus, we nọgide n'ebe ahu ubọchi atọ. Ayi we site n'ebe ahu ga buruburu, we rue Rijiọm: mb͕e otù ubọchi gasiri ifufe Ndida we febe, n'ubọchi nke-abua ayi we bia rue Pọtiọli: ebe ayi huru umu-nna nime Kraist, ewe riọ ayi ka ayi na ha nọgide ubọchi asa: otú a ayi we bia rue Rom.