ỌLU NDI-OZI 27:20-27
ỌLU NDI-OZI 27:20-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị. Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a. Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu a ga-atụfu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu. Nʼihi na nʼabalị gara aga, mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m, ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’ Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m. Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.” Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso.
ỌLU NDI-OZI 27:20-27 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e ọ nādighi anyanwu ma-ọbu kpakpando nāmukwasi ayi ọtutu ubọchi, mb͕e ọ dighi kwa oké ifufe ntà nēfekwasi ayi, ewe wepu olile-anya nile na agāzọputa ayi site n'ub͕u a. Mb͕e ha nọdusiri rue oge di anya nērighi ihe, mb͕e ahu Pọl we guzo n'etiti ha, si, Ndikom, o kwesiri ka unu kweyerem, ghara kwa inupu ub͕ọ na Krit, na inwe nbibi a na iyì a. Ub͕u a adọkwam unu aka na nti ka unu nwere obi-utọ: n'ihi na ọ dighi ntufu gādi n'etiti unu, kama ọ bu ntufu nke ub͕ọ. N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a, si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ. N'ihi nka, ndikom, nwenu obi-utọ: n'ihi na ekwerem Chineke, na ọ gādi otú a ọbuná dika agwaworom. Otú ọ di aghaghi itupu ayi n'elu otù agwe-etiti. Ma mb͕e o ruru abali nke-iri-na-anọ, mb͕e ayi nērughari n'osimiri Adria, dika etiti abali ndi-ub͕ọ chère na ha nābiaru otù ala nso