ỌLU NDI-OZI 25:13-19
ỌLU NDI-OZI 25:13-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs. Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a. Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe. “Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo. Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ. Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere. Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ.
ỌLU NDI-OZI 25:13-19 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, Agripa, bú eze, na Banaisi ruru Sisaria, kele kwa Festọs. Mb͕e ha nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, Festọs we debe okwu bayere Pọl n'iru eze ahu, si, Otù nwoke di onye Filiks rapuworo n'ulo-nkpọrọ: mb͕e m'nọ na Jerusalem, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we gwam okwu bayere ya, nāriọ ka ama ya ikpé. M'we za ha, si, na ọ bughi ọme-n'ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n'iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n'ihe eboro ya. Ya mere mb͕e ha biakọrọ n'otù n'ebe a, alaghm azu, ma ubọchi so ya m'nọduru n'oche-ikpé, si ka ekuta nwoke ahu. Ma mb͕e ndi nēbo ya ebubo guzoro ọtọ, ha ejighi ihe ọ bula nime ihe ọjọ mu onwem chère we bo ya; ma ha ji ajuju ufọdu megide ya bayere nsọpuru-chi nke aka ha, na ajuju bayere otù Jisus, Onye nwururi anwu, Onye Pọl nāsi na Ọ di ndu.