ỌLU NDI-OZI 23:1 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌLU NDI-OZI 23:1 IGBOB (Bible Nso)
Pọl we legide nnọkọ-ikpé ahu anya, si Umu-nnam, mu onwem ewerewo ezi akọ-na-uche nile biri n'iru Chineke dika onye-Ju rue ubọchi ta.
ỌLU NDI-OZI 23:1 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.”