Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 22:1-21

ỌLU NDI-OZI 22:1-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nʼihu unu.” Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nʼasụsụ Hibru, ha deere duu karịa. Mgbe ọ sịrị, “Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa. Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ. Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ. “Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m. Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’ “ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. “Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’ Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu. “Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’ Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs. “Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ. Ọ bịakwutere m, guzoro nʼakụkụ m sị, ‘Nwanna anyị Sọl, ka emee ka ị hụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ, e nwetara m ike ịhụ ụzọ, m hụkwara ya. “Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya. Ị ga-abụ onyeama ya nye ndị niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ. Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị baptizim, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’ “Mgbe m lọghachikwara na Jerusalem, nọrọ na-ekpe ekpere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ahụrụ m ọhụ, ebe ọ na-agwa m, ‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nʼihi na ndị bi nʼala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere m.’ “Ma asịrị m, ‘Onyenwe anyị, ndị a maara nke ọma na m na-aga nʼụlọ nzukọ nʼotu nʼotu, na-atụba ndị kwere na gị nʼụlọ mkpọrọ, na-etikwa ha ihe. Nʼoge a na-awụfu ọbara onyeama gị bụ Stivin, eguzo m nso na-akwado nʼihe emere dị mma, ma na-elekọtakwa uwe ndị ahụ tụgburu ya anya.’ “Mgbe ahụ, ọ sịrị m, ‘Gawa; nʼihi na aga m ezipu gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ.’  ”

ỌLU NDI-OZI 22:1-21 Bible Nso (IGBOB)

Umu-nnem na ndi bu nnam, nurunu ngọpum n'ebe unu nọ ub͕u a. Mb͕e ha nuru na ọ nāgwa ha okwu n'asusu Hibru, ha we kpuchie ọnu-kari: o we si, Mu onwem bu onye-Ju, nke amuru na Tasọs nke Silisia, ma azùputaram n'obodo a, n'ukwu Gameliel, ezíwo mu ihe, dika esi edebezu iwu nke nna-ayi-hà, obim nānu ọku nye Chineke, dika unu onwe-unu nile di ta: esob͕u-kwa-ram Uzọ a rue ọnwu, nēke ma ndikom ma ndinyom ab͕u nārara kwa ha nye n'ulo-nkpọrọ di iche iche. Dika onye-isi-nchu-àjà nāb͕a-kwa-ram àmà, ya na nb͕akọ ndi-okenye nile: ndi m'nata-kwa-ra akwukwọ-ozi n'aka-ha inye umu-nne-ayi, m'we ga Damaskọs, idọkputa kwa ndi nọ n'ebe ahu n'ab͕u bia na Jerusalem, ka ewe me ka ha hu ahuhu-nmehie. O we rue, mb͕e m'nāga, nābiaru kwa Damaskọs nso, n'oge di ka etiti-ehihie, na mberede oké ìhè si n'elu-igwe b͕urum àmùmà buruburu. M'we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsim, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um? Mu onwem we za, si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? O we sim, Mu onwem bu Jisus Onye Nazaret, Onye gi onwe-gi nēsob͕u. Ma ndi mu na ha nọ kiliri ìhè ahu n'ezie, ma ha anughi olu Onye ahu nāgwam okwu. M'we si, Gini ka m'gēme, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we sim, Bilie, ga ba na Damaskọs; n'ebe ahu ka agāgwa kwa gi okwu bayere ihe nile nke akaworo gi ka i me. Mb͕e m'nāhughi uzọ site ebube ìhè ahu, ndi mu na ha nọ we jidem n'aka durum, m'we ba na Damaskọs. Otù onye, bú Ananaias, nwoke nke nātu egwu Chineke dika iwu-ayi si di, onye ndi-Ju nile bi n'ebe ahu b͕ara ezi àmà, o we biakutem, guzo n'akukum, sim, Sọl, nwa-nnam, ka eme ka i hu uzọ. N'otù oge hour ahu ewe me ka mu onwem hu uzọ, m'we le ya anya. O we si, Chineke nke nna-ayi-hà rọputara gi imara ihe Ọ nāchọ, na ihu Onye Ezi Omume ahu, na inu olu si n'ọnu-Ya puta. N'ihi na i gāburu Ya onye-àmà n'ebe madu nile nọ nke ihe nile i huworo nu kwa. Ub͕u a kwa gini mere i nāla azu? bilie, ka eme gi baptism, sachapu kwa nmehie-gi nile, nākpọku aha-Ya. O we rue, mb͕e m'laghachisiri na Jerusalem, mb͕e m'nēkpe kwa ekpere n'ulo uku Chineke, na ihe di ka inyoghi biaram n'anya, m'we hu Ya ka Ọ nāsim, Me ngwa, si na Jerusalem pua ọsọsọ: n'ihi na ha agaghi-anara àmà bayerem n'aka-gi. Mu onwem we si, Onye-nwe-ayi, ha onwe-ha mara na mu onwem nātubà ndi kwere na Gi n'ulo-nkpọrọ, nēti kwa ha ihe n'ulo-nzukọ nile n'otù n'otù: mb͕e anāwusi ọbara Stifen onye-àmà-Gi, mu onwem guzo-kwa-ra nso, o we dim ezi nma, anamedebe kwa uwe nke ndi nēb͕u ya. O we sim, Ga ije-gi: n'ihi na Mu onwem gēsi n'ebe a zipu gi jekuru ndi mba ọzọ n'ebe di anya.