Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 20:1-16

ỌLU NDI-OZI 20:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia. Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis. Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi. Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Arịstakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi na Timoti, na Taịkikọs na Trofimọs, ndị Eshịa sokwa ya na-aga ije a. Ndị a bu ụzọ gawa, na-eche anyị na Troas. Mgbe Mmemme Ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai bịakwute ha na Troas nʼụbọchị nke ise. Anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị asaa. Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị. Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ. Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ. Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.” Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya. Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu. Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ. Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen. Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs. Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime.

ỌLU NDI-OZI 20:1-16 Bible Nso (IGBOB)

Ma mb͕e ùzù ahu tubìri, mb͕e Pọl kpọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, kasi kwa ha obi, o kele ha ekele ikpe-azu we pua iga ba na Masedọnia. Mb͕e ọ gabigasiri n'akuku ahu nile, were kwa ọtutu okwu kasie ha obi, ọ bia na Gris. Mb͕e ọ nọsiri ọnwa atọ n'ebe ahu, mb͕e ndi-Ju b͕a-kwa-ra ajọ ìzù megide ya, mb͕e ọ gaje inupu ub͕ọ ije Siria, o zubere isi uzọ Masedọnia laghachi. Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, we so ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, nime ndi Tesalọnaika; na Gaiọs nke Dabe, na Timọti, na Tikikọs na Trọfimọs, bú ndi Esia. Ma ndia bururi uzọ je, we nēche ayi na Troas. Ayi onwe-ayi we si na Filipai ba n'ub͕ọ je, mb͕e ubọchi achicha ekoghi-eko gasiri, ayi we biakute ha na Troas ka o ruru ubọchi ise; ebe ayi nọgidere ubọchi asa. N'ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa, mb͕e ayi zukọrọ inyawa achicha, Pọl we gwa ha okwu, ebe ọ gaje ila echi-ya; o we kwugide okwu rue etiti abali. Ọtutu ọku-ọwa di kwa n'ime-ulo nke di n'elu ulo, ebe ayi zukọrọ. Ma otù okorọbia, aha-ya bu Yutikọs, nānọdu na window, onye oké ura nākwada; mb͕e Pọl nēkwu okwu rue oge dikari anya, ebe ura-ya kwadara ya o we si n'ulo elu nke-atọ di n'ulo ahu da n'ala, o mewo ozu mb͕e ha buliri ya. Ma Pọl ridara, dakwasi ya, makua ya, si, Unu atula ùzù; n'ihi na ndu-ya di nime ya. Mb͕e ọ rigosiri, nyawa achicha, ri kwa, mb͕e ya na ha kparitasi-kwa-ra ogologo oge, ọbuná rue chi-ọbubọ, o we pua otú a. Ha we kuta nwa-okoro ahu na ndu, ọ bughi kwa nkasi-obi ntà akasiri ha. Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi buru uzọ je ub͕ọ, ayi nupuru ub͕ọ ahu ije Asọs, n'ihi na ayi zubere iwere Pọl n'ub͕ọ n'ebe ahu: n'ihi na otú a ka ọ karari, ebe o zubere na ya onwe-ya gāga n'ukwu-ala. Mb͕e o zutere ayi n'Asọs, ayi were ya n'ub͕ọ, we bia rue Mitilini. Ayi we si n'ebe ahu ga, we rue na ncherita-iru Kaiọs n'ubọchi soni; ubọchi so ya ayi we rue ala na Samọs, we chere oge ufọdu na Trogilium; ubọchi soni ayi we bia rue Militọs. N'ihi na Pọl zubereri igabiga Efesọs n'ub͕ọ, ka aghara ime ya ka ọ nọgide ogologo oge n'Esia; n'ihi na ọ nēme ngwa iru Jerusalem mb͕e ubọchi Pentikọst akērughi, ma ọ buru na ọ puru ime ya.