ỌLU NDI-OZI 19:13-22
ỌLU NDI-OZI 19:13-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.” Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa nke Skiva, onyeisi nchụaja, bụ onye Juu. Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?” Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ. Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs niile. Mgbe ahụ, ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidekwara ha. Nʼihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nʼebe niile. Ọtụtụ ndị kwenyerenụ bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha niile, nʼihu mmadụ niile. Ọtụtụ nʼime ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị bupụtara akwụkwọ niile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nʼihu mmadụ niile. Akwụkwọ niile a kpọrọ ọkụ nʼụbọchị ahụ ga-eru ego ruru puku ọlaọcha iri ise. Ya mere, okwu Onyenwe anyị toro, na-agbasa nʼike nʼike na-adịkwa ire. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.” O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.
ỌLU NDI-OZI 19:13-22 Bible Nso (IGBOB)
Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi. Umu-ndikom asa nke otù onye-Ju, anākpọ Skiva, bú onye-isi-nchu-àjà, di, ndi mere nka. Ajọ mọ ahu we za, si ha, Jisus ka m'matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bu ole ndi? Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru. Ewe me ka ndi nile ndi bi n'Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku. Ọtutu madu n'etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme. Ọ dighi kwa madu ole-na-ole n'etiti ndi nēme mb͕asi kpokọtara akwukwọ-ha, rechapu ha ọku n'iru ọra madu: ha we gua ọnu-ahia-ha, we hu na ọ bu ọgu nnù ego ọla-ọcha isi na nnù ise. Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè. Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m'rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom. Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge.