ỌLU NDI-OZI 17:26-29
ỌLU NDI-OZI 17:26-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha. Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya. ‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’ “Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ.
ỌLU NDI-OZI 17:26-29 Bible Nso (IGBOB)
O we site n'otù onye kè mba nile n'otù n'otù nke madu, ka ha biri n'elu uwa nile, mb͕e O debesiri oge-ha akaworo àkà na ókè nile nke ebe-obibi-ha; ka ha we chọ Chineke, ma eleghi anya ha gāsọ ìsì, we chọta Ya, ọ bu ezie na Ọ nọghi n'ebe di anya n'aru onye ọ bula nime ayi: n'ihi na ọ bu nime Ya onwe-ya ka ayi nādi ndu, nējeghari kwa, nādi kwa; dika ufọdu ọbuná nime ndi nke unu ndi nēme abù kwuworo, si, N'ihi na ayi bu kwa ndi Ọ muru. Ya mere ebe ayi bu ndi Chineke muru, o kwesighi ka ayi nēchè na Ihe akpọrọ Chineke yiri ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu nkume, ihe apiri api site na ǹkà na ihe di n'obi madu.