Mafee gaa na ọdịnaya

ỌLU NDI-OZI 13:43 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌLU NDI-OZI 13:43 IGBOB (Bible Nso)

Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke.

ỌLU NDI-OZI 13:43 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke.