ỌLU NDI-OZI 13:24-52
ỌLU NDI-OZI 13:24-52 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị. Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’ “Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile. Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ. Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya. Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya. Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya. “Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha. O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “ ‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’ Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’ E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma, “ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’ “Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure. Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure. “Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu. A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume. Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu. “ ‘Lee, unu ndị na-akwa emo, nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi. Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị unu nke unu na-agaghị ekwe na o mere, ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’” Mgbe Pọl na Banabas na-apụ, ndị mmadụ rịọrọ ha ka ha bịakwa nʼizu ụka ọzọ gwa ha okwu gbasara ihe ndị a. Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke. Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị. Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu. Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ. Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu, “ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’” Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ. Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ. Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ. Ha tichapụrụ aja dị nʼụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka na ntị mmegide ha. Ha hapụrụ obodo ahụ gaa Aikoniọm. Ma ndị na-eso ụzọ ya jupụtakwara nʼọṅụ na nʼike nke Mmụọ Nsọ.
ỌLU NDI-OZI 13:24-52 Bible Nso (IGBOB)
mb͕e Jọn buru uzọ kwusa baptism nke nechègari nye ndi Israel nile, mb͕e Ọ kābataghi. Ma mb͕e Jọn nāb͕azu ọsọ-ya, ọ si, Gini ka unu nēchè na abum? Mu onwem abughi Ya. Kama, le, otù Onye nābia n'azum, Onye m'nēkwesighi itọpu akpukpọ-ukwu nke ukwu-Ya. Umu-nnem, umu eriri Abraham, na ndi di n'etiti unu nātu egwu Chineke, ọ bu ayi onwe-ayi ka eziputara okwu nke nzọputa nka. N'ihi na ndi bi na Jerusalem, na ndi-isi-ha, ebe ha nāmataghi Ya, na olu ndi-amuma nke anāgu n'ubọchi-izu-ike nile, ha mezuru ha n'ima Ya ikpé. Ọ bu ezie na ha ahughi ihe ọ bula kwesiri ọnwu n'aru Ya, ma ha riọrọ Pailet ka eb͕ue Ya. Mb͕e ha mezuru ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ bayere Ya, ha si n'osisi ahu wedata Ya, tọb͕ọ Ya n'ílì. Ma Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie: ewe me ka ha hu Ya ọtutu ubọchi, bú ndi soro Ya si na Galili rigoro Jerusalem, ndi buru ndi-Ju ndi-àmà-Ya ub͕u a. Ayi onwe-ayi nēzì kwa unu ozi ọma nke nkwa ahu ekwere nna-ayi-hà, na Chineke emezuwo nka n'ebe umu-ayi nọ, ebe O mere ka Jisus bilie; dika edewo-kwa-ra ya n'abù ọma nke-abua, si, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta. Ma na O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ dighi na Ọ gaje ilaghachi n'ire-uré ọzọ, O kwuwo otú a, si, M'gēnye unu ihe nile di ọcha nke kwesiri ntukwasi-obi nke ekwere Devid na nkwa. N'ihi na Ọ nāsi kwa n'abù ọma di iche, I gaghi-enye Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré. N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré: ma Onye ahu Chineke mere ka O bilie ahughi ire-uré. Ya mere maranu nka, umu-nnem, na anēsite n'ọnu Onye a kwusa nb͕aghara nmehie nile nye unu: ọ bu kwa nime Onye a ka anāgu onye ọ bula nke kwere na Ya n'onye ezi omume n'ihe nile, nke anāpughi igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses. Ya mere lezienu anya, ka ihe ahu ghara ibiakwasi unu, nke ekwuworo n'akwukwọ ndi-amuma, si, Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu; N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu, Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya. Mb͕e ha nāpu, ha we riọ ka agwa ha okwu ndia n'ubọchi-izu-ike soni. Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke. Ma n'ubọchi-izu-ike soni ọ fọduru ihe ntà ka obodo ahu nile zukọ inu okwu Chineke. Ma mb͕e ndi-Ju huru ìgwè madu ahu, ha juputara n'ekworo, we nēkwugide ihe nile Pọl nēkwu, ha nēkwulu kwa ha. Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu. n'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi nyeworo ayi iwu, si, Edebewom I ka I buru ìhè nke mba nile, Ka I we di inye nzọputa rue nsọtu uwa. Ma mb͕e ndi mba ọzọ nuru nka, ha ṅuria, nye kwa okwu Chineke otuto: ha we kwere na Jisus, ka ha ra, bú ndi edoro inata ndu ebighi-ebi. Ewe nēbu okwu Onye-nwe-ayi jezu ala ahu dum. Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n'ókè-ala-ha. Ma ha rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha, we bia rue Aikọniọm. Ndi nēso uzọ Jisus we juputa n'ọṅù na Mọ Nsọ.