Mafee gaa na ọdịnaya

ỌLU NDI-OZI 12:20 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌLU NDI-OZI 12:20 IGBOB (Bible Nso)

Ma Herod nēbu agha nke-uku megide Taia na Saidon n'obi-ya: ha we were otù obi biakute ya; mb͕e ha mesiri Blastọs eyì-ha, nke bu onye nēle ime-ulo-ndina nke eze anya, ha we riọ ka udo di n'etiti ha, n'ihi na esi n'ala nke eze ahu azù ala-ha.

ỌLU NDI-OZI 12:20 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Nʼoge ahụ Herọd na-eweso ndị Taịa na Saịdọn iwe, ha zipụrụ ndị ozi ha izute ya. Ha buru ụzọ mee ka ha na Blastọs bụrụ enyi, onye eze tụkwasịrị obi nke na-elekọtakwa ime ụlọ ndina eze anya. Ha rịọrọ ya ka udo dịrị, nʼihi na a na-esi nʼobodo eze na-enwetara ha ihe oriri.