ỌLU NDI-OZI 1:3-5 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌLU NDI-OZI 1:3-5 IGBOB (Bible Nso)
ndi O ji kwa ọtutu uzọ nādighi igọ agọ che Onwe-ya n'iru ha na ndu mb͕e Ọ husiri ahuhu, ebe O mere ka ha nāhu Ya anya n'ogologo ọgu ubọchi abua, O nēkwu kwa ihe nile bayere ala-eze Chineke: mb͕e Ya na ha zukọrọ O we nye ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pua, kama ka ha chere nkwa nke Nna-Ya, nke unu nuru n'ọnum, ka O kwuru: n'ihi na Jọn jiri miri me baptism n'ezie; ma agēji Mọ Nsọ me unu baptism mb͕e ọtutu ubọchi nāgaghi-agabiga site n'ub͕u a.
ỌLU NDI-OZI 1:3-5 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke. Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m. Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”