III. JỌN 1:6-8
III. JỌN 1:6-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto. Ọ bụ nʼihi aha ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe. Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ.
Kesaa
Gụọ III. JỌN 1III. JỌN 1:6-8 Bible Nso (IGBOB)
ndi b͕ara àmà ihu-n'anya-gi n'iru nzukọ Kraist: ndi i gēme nke-ọma idupu ha n'ije-ha dika o kwesiri imere Chineke: n'ihi na ọ bu n'ihi Aha ahu ka ha puru, nānaraghi ihe ọ bula n'aka ndi mba ọzọ. Ya mere ayi onwe-ayi ji ugwọ ikpọbata madu di otú a, ka ayi we buru kwa ndi soro ezi-okwu ahu nālukọ ọlu.
Kesaa
Gụọ III. JỌN 1