Mafee gaa na ọdịnaya

II. NDI TESALỌNAIKA 2:1-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

II. NDI TESALỌNAIKA 2:1-4 IGBOB (Bible Nso)

Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, n'ihi ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na nzukọ ayi gēzukọ n'ebe Ọ nọ; ka ewe ghara isite n'aka mọ, ma-ọbu okwu, ma ọbu akwukwọ-ozi di ka o sitere n'aka-ayi, me ka unu me nkpatu pua n'uche-unu ọsọsọ, ma-ọbu ka unu tua ujọ, dika agāsi na ubọchi Onye-nwe-ayi di ub͕u a: unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì, onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n'ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.

II. NDI TESALỌNAIKA 2:1-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna. Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola. Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi. Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.