II. SAMUEL 3:3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
II. SAMUEL 3:3 IGBOB (Bible Nso)
nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua
II. SAMUEL 3:3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke abụọ bụ Kiliab, nke Abigel, nwunye ochie Nebal, onye Kamel mụrụ. Nke atọ bụ Absalọm, nke Maaka nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua mụrụ.