Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 23:8-39

II. SAMUEL 23:8-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere: Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha. Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ, ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. ONYENWE ANYị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ. Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ. Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. ONYENWE ANYị nyere mmeri dị ukwuu. Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim. Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem. Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!” Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu ONYENWE ANYị. Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, ONYENWE ANYị, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara. Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha. Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ. A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche. Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ: Asahel, nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem Shama, onye Harod, Elika, onye Harod, Helez onye Palti, Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa, Abieza, onye Anatot, Mebunai, onye Husha, Zalmon, onye Ahohi, Maharai, onye Netofa, Heled, nwa Baana, onye Netofa, Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, Benaya, onye Piraton, Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, Abi-Albon, onye Arba, Azmavet, onye Bahurim Eliaba, onye Shaalbon, Ụmụ Jashen, Jonatan nwa Shama, onye Hara Ahiam, nwa Shara nke Hara, Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka, Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo, Hezro, onye Kamel, Paraị, onye Aaba, Igal nwa Netan, onye Zoba, nwa Hagri, Zelek, onye Amọn, Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya, Ira, onye Itra, Gareb, onye Itra na Ụraya, onye Het.

II. SAMUEL 23:8-39 Bible Nso (IGBOB)

Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò. Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro: onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u. Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n'usu, ma òkè ubi di n'ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n'iru ndi Filistia. O we guzo onwe-ya n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku. Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n'owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim. Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu. Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama: Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova. Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere. Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu. Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò. Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya. Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu. Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-ya. Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem; Shama onye Harod, Elika onye Harod; Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa; Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha; Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa; Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin; Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash; Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim; Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan; Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait; Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo; Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab; Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad; Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia; Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta; Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.