Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 21:1-14

II. SAMUEL 21:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ụnwụ dara afọ atọ nʼoge Devid na-achị, afọ kwa afọ. Devid chọrọ ihu ONYENWE ANYị. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sịrị, “Ọ bụ maka Sọl na ọbara ụlọ ya kwafuru, nʼihi na o gburu ndị Gibiọn.” Eze kpọrọ ndị Gibiọn, gwa ha okwu. (Ndị Gibiọn abụghị ndị Izrel, kama ha bụ ndị fọdụrụ nʼime ndị Amọrait, ndị bi nʼala Kenan mgbe ụmụ Izrel batara. Mgbe ahụ ha batara, ndị Izrel ṅụrụ iyi nye ndị Gibiọn na ha agaghị egbu ha, ma Sọl sitere nʼịnụ ọkụ nke obi nʼihi Izrel na Juda chọọ ikpochapụ ha.) Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa ONYENWE ANYị?” Ndị Gibiọn zara ya sị, “Nsogbu anyị na Sọl na ndị ụlọ ya abụghị ihe a ga-eji ọlaọcha maọbụ ọlaedo mezie. Anyị achọkwaghị ka onye ọbụla nʼIzrel nwụọ nʼihi anyị.” Devid sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel. Ka akpọnye anyị ndị ikom asaa site nʼụmụ ya, ka anyị kwụgbuo ha nye ONYENWE ANYị na Gibea Sọl, onye ONYENWE ANYị họpụtara.” Eze zara sị, “Aga m akpọnye unu ha.” Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu ONYENWE ANYị. Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola. O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu ONYENWE ANYị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị. Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha. Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere, ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa. Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu. Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.

II. SAMUEL 21:1-14 Bible Nso (IGBOB)

Oké unwu we di n'ubọchi Devid arọ atọ n'usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n'ihi Sọl na n'ihi ulo ọbara ya, n'ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua. Eze we kpọ ndi Gibeon, si ha; (ma ndi Gibeon, ọ bughi n'umu Israel ka ha sitere, kama ha sitere na ndi-Amorait fọduru; ma umu Israel ṅuru ha iyi: ma Sọl chọrọ itib͕u ha n'ekworo n'ihi umu Israel na Juda:) Devid we si ndi Gibeon, Gini ka m'gēmere unu? gini kwa ka m'gēji kpuchie nmehie, ka unu we gọzie ihe-nketa Jehova? Ndi Gibeon we si ya, Ọ dighi ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo diri ayi n'ebe Sọl nọ, ma-ọbu n'ebe ulo-ya nọ: ọ dighi kwa nwoke ọ bula agēme ka ọ nwuara ayi n'Israel. O we si, Ihe unu onwe-unu nāsi, ihe ahu ka m'gēmere unu. Ha we si eze, Nwoke ahu nke mere ka ayi gwusia, nke zube-kwa-ra imegide ayi, ewe kpochapu ayi ka ayi ghara iguzo onwe-ayi n'ókè-ala ọ bula nke Israel, ka enye ayi ndikom asa sitere n'umu-ya, ayi gākwuba kwa ha nye Jehova nime Gibea Sọl, onye Jehova rọputara. Eze we si, Mu onwem gēnye unu ha. Ma eze nwere ọmiko n'aru Mefiboshet, nwa Jonatan nwa Sọl, n'ihi ọṅuṅu-iyi Jehova nke di n'etiti ha, bú n'etiti Devid na Jonatan nwa Sọl. Eze we chiri umu-ndikom abua nke Rizpa nwa-nwayi Aia, ndi ọ muru Sọl, bú Amoni na Mefiboshet; na umu-ndikom ise nke Maikal nwa-nwayi Sọl, ndi ọ muru Adriel nwa Bazilai onye Mehola: o we nye ha n'aka ndi Gibeon, ha we kwuba ha n'ugwu n'iru Jehova: ha asa we da n'otù: ma emere ka ndi ahu nwua n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, n'ubọchi mbu, na nmalite obìbì ọka barley. Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n'elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n'elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n'ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n'abali. Ewe gosi Devid ihe Rizpa nwa Aia, nwayi bu iko Sọl, mere. Devid we je chiri ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya n'aka ndi-nwe Jebesh-gilead, ndi zupuru ha n'amá Bet-shan, ebe ndi Filistia kwubara ha, n'ubọchi ndi Filistia tib͕uru Sọl nime Gilboa: o we si n'ebe ahu chigota ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya; ha chikọta-kwa-ra ọkpukpu ndi akwubara. Ha we lìe ọkpukpu Sọl na Jonatan nwa-ya n'ala Benjamin nime Zela, n'ílì Kish, bú nna-ya: ha we me ihe nile eze nyere n'iwu. Ewe riọta Chineke aririọ bayere ala ahu mb͕e ihe a gasiri.