II. SAMUEL 12:1-31 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
II. SAMUEL 12:1-31 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ONYENWE ANYị zigara Netan ka o jekwuru Devid. Mgbe Netan bịakwutere Devid, ọ kọọrọ ya akụkọ a, “E nwere ndị ikom abụọ bi nʼotu obodo, otu bụ ọgaranya ma nke ọzọ bụ ogbenye. Onye ọgaranya a nwere ọtụtụ igwe atụrụ na igwe ehi. Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya. “Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.” Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha ONYENWE ANYị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ! Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.” Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl. Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu. Gịnị mere i ji lelịa okwu ONYENWE ANYị anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya. Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’ “Ihe a ka ONYENWE ANYị kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile. I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ” Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide ONYENWE ANYị.” Netan zara sị ya, “ONYENWE ANYị nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ. Ma nʼihi na i meela ka ndị iro ONYENWE ANYị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.” Mgbe Netan lara, ONYENWE ANYị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa. Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu ONYENWE ANYị. Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla. Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.” Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?” Ha zara sị ya, “E, ọ nwụọla!” Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ ONYENWE ANYị, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri. O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.” Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, ONYENWE ANYị ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’ Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.” Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma ONYENWE ANYị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya. O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi ONYENWE ANYị. Nʼoge a, Joab busoro Raba obodo ndị Amọn agha dọta isi obodo eze ha nʼagha. Joab zigara Devid ozi sị ya, “Ebuola m agha megide Raba dọta isi mmiri ọṅụṅụ ya nʼagha. Ugbu a chịkọtaa ndị agha fọdụrụ bịa lụpụchaa agha a, ka ị dọta obodo a nʼagha. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m adọta obodo a nʼagha, a ga-akpọkwasịkwa ya aha m.” Nʼihi nke a, Devid duuru ndị agha Izrel jeruo Raba, buso ya agha, meriekwa ya. Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.
II. SAMUEL 12:1-31 IGBOB (Bible Nso)
Jehova we zìe Netan jekuru Devid. O we biakute ya, si ya, Ndikom abua di n'otù obodo; otù bu ọgaranya, nke-ọzọ bu ob͕eye. Ọgaranya ahu nwere ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi bara uba nke-uku. Ma ob͕eye ahu enweghi ihe ọ bula, ma-ọbughi otù nwa-nne-aturu ntà, nke ọ zutara debe ya ndu: o we nọyere ya, nọye-kwa-ra umu-ya, tolite; n'iberibe ihe-oriri-ya ka ọ nēri, n'iko-ya ka ọ nāṅu kwa, n'obi-ya ka o nēdina kwa, o we ghọrọ ya nwa-nwayi. Onye-ije we biakute ọgaranya ahu, o we rapu iwere anu n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya ma-ọbu n'etiti ìgwè ehi-ya, idoziri onye-ije ahu nke biakutere ya, ma o were nwa-nne-aturu nke ob͕eye, doziere nwoke ahu biakutere ya. Iwe Devid we di ọku nke-uku megide nwoke ahu; o we si Netan, Jehova nādi ndu, n'ezie onye kwesiri ọnwu ka nwoke ahu bu nke nēme ihe a: ma nwa-nne-aturu ahu, ọ gākwughachi kwa ya ob͕eye ahu okpukpu anọ, n'ihi na o mere ihe a, na n'ihi na o nweghi ọmiko. Netan we si Devid, Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu. Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem tere gi manu ibu eze Israel, Mu onwem naputa-kwa-ra gi n'aka Sọl; M'we nye gi ulo onye-nwe-gi, na ndinyom onye-nwe-gi n'obi-gi, nye kwa gi ulo Israel na nke Juda; ma ọ buru na nke ahu di ntà, M'gātukwasi-kwa-ra gi otú a na otú a. Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n'anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n'onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya. Ma ub͕u a mma-agha agaghi-ewezuga onwe-ya n'ulo-gi rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na i lelìwom, we kuru nwunye Uraia onye-Het ka ọ ghọrọ gi nwunye. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a. N'ihi na gi onwe-gi mere ya na nzuzo: ma Mu, onwem gēme ihe a n'iru Israel nile, na n'iru anyanwu. Devid we si Netan, Emehiewom megide Jehova. Netan we si Devid, Jehova emewo kwa ka nmehie-gi gabiga; i gaghi-anwu. Otú ọ di, n'ihi na i mewo ka ndi-iro Jehova kpọlu nkpọlu nke-uku n'okwu a, nwa-nwoke nke amuru gi aghaghi inwu kwa. Netan we la n'ulo-ya. Jehova we tie nwata ahu ihe-otiti, bú nke nwunye Uraia muru nye Devid, o we nāria ọria nke-uku. Devid we riosie Chineke aririọ ike bayere nwata ahu; Devid we nēbu ọnu, ba nime, dina ala ogologo abali nile. Ndi-okenye ulo-ya we bilie n'akuku ya, ime ka o si n'ala bilie: ma o kweghi, o soghi kwa ha ri nri. O rue, n'ubọchi nke-asa, na nwa ahu nwuru. Ndi-orù Devid we tua egwu igosi ya na nwa ahu anwuwo: n'ihi na ha siri, Le, mb͕e nwa ahu nọ na ndu, ayi gwara ya okwu, ma o geghi nti n'olu-ayi: àyi gēsi kwa aṅa si ya, Nwa ahu anwuwo, o we me onwe-ya ihe ọjọ? Devid we hu na ndi-orù-ya nātakwurita onwe-ha, Devid we mata na nwa ahu anwuwo: Devid we si ndi-orù-ya, Nwa ahu, ọ̀ nwuwo? Ha si, Ọ nwuwo. Devid we si n'ala bilie, sa aru, te onwe-ya manu, b͕anwe uwe-nb͕okwasi-ya; o we ba n'ulo Jehova, kpọ isi ala: o we ba n'ulo-ya, jua ha, ha we d-oba nri n'iru ya, o rie. Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n'ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri. Ọ si, Mb͕e nwa ahu nọ na ndu, eburum ọnu, kwa ákwá' n'ihi na m'siri, Ònye mara? eleghi anya Jehova gēmerem amara, ka nwa ahu we di ndu. Ma ub͕u a ọ nwuwo, n'ìhi gini kwa ka mu onwem gēbu ọnu? àpurum iweghachi ya ọzọ? Mu onwem nālakuru ya, ma ya onwe-ya agaghi-alaghachikutem. Devid we kasie Bat-sheba, bú nwunye-ya, obi, we bakuru ya, ya na ya we dina: o we mua nwa-nwoke, Devid we kpọ aha-ya Solomon. Jehova we hu ya n'anya; O we zìe site n'aka Netan, bú onye-amuma, kpọ aha-ya Jedidaia, n'ihi Jehova. Ma Joab busoro Raba nke umu Amon agha, were obodo eze. Joab we zigara Devid ndi-ozi, si, Ebusowom Raba agha, ewerewokwam obodo miri. Ma ub͕u a, chikọta ndi Israel fọduru, ma kwa ulo-ikwū-gi megide obodo ahu, were ya; ka mu onwem ghara iwere obodo ahu, ewe kpọkwasi ya aham. Devid we chikọta ndi Israel nile, jerue Raba, buso ya agha, were ya. O we kpupu okpu-eze nke eze-ha n'isi-ya; ọtùtù-ya bu otù talent ọla-edo, nkume di oké ọnu-ahia di kwa ya; o we di n'isi Devid. O weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku. O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o tiye ha n'okpuru mma-nkwọ, na n'okpuru ígwè nēbì ihe, na n'okpuru anyu-ike ígwè, me kwa ka ha gabiga n'ihe eji akpu brick: otú a ka ọ nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.