II. PITA 2:1-3
II. PITA 2:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi. Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ. Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.
II. PITA 2:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndi-amuma ugha putakwara ìhè n'etiti ndi Israel, dika ndi-ozizí ugha gādi kwa n'etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n'iyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye b͕ara ha, ndi nēweta ila-n'iyì di ngwa tukwasi onwe-ha n'isi. Ọtutu madu gēso kwa uzọ agu-ikwa-iko-ha; ndi agēkwulu uzọ nke ezi-okwu n'ihi ha. Nime anya-uku ka ha gēji kwa okwu nrafu di iche iche were unu zua ahia: ndi ọmuma-ikpe-ha nābughi ihe nādighi-alu ọlu site n'oge ochie, ila-n'iyì-ha adighi-atu kwa ura.