Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. PITA 2:1-11

II. PITA 2:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi. Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ. Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra. Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ. Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke; ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere (nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ). Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ. Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi karịrị ha nʼịdị ike, nweekwa ume karịa, ma ha anaghị e kpegide ha ikpe nkwujọ nʼihu Onyenwe anyị.

II. PITA 2:1-11 Bible Nso (IGBOB)

Ma ndi-amuma ugha putakwara ìhè n'etiti ndi Israel, dika ndi-ozizí ugha gādi kwa n'etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n'iyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye b͕ara ha, ndi nēweta ila-n'iyì di ngwa tukwasi onwe-ha n'isi. Ọtutu madu gēso kwa uzọ agu-ikwa-iko-ha; ndi agēkwulu uzọ nke ezi-okwu n'ihi ha. Nime anya-uku ka ha gēji kwa okwu nrafu di iche iche were unu zua ahia: ndi ọmuma-ikpe-ha nābughi ihe nādighi-alu ọlu site n'oge ochie, ila-n'iyì-ha adighi-atu kwa ura. N'ihi na asi na Chineke emereghi ndi-mọ-ozi ebere mb͕e ha mehiere, kama Ọ tubàra ha n'ime-ime ọku ala-mọ, we rara ha nye n'olùlù nke ọchichiri, ka ewe debe ha ikpe ikpé; asi kwa na O mereghi uwa ochie ebere, kama ọ bu Noa, onye mere ha asatọ, bú onye nēkwusa ezi omume, ka O chere, mb͕e O mere ka iju-miri biakwasi uwa nke ndi nādighi-asọpuru Chineke; O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke; O we dọputa Lot, bú onye ezi omume, mb͕e ibi-obi n'agu ikwa-iko nke ndi ahu ndi nēmebi iwu nēwuta ya nke-uku (n'ihi na onye ezi omume ahu, ebe o nēbi n'etiti ha, o were ọlu-ha nke nēmebi iwu mekpa nkpuru-obi ezi omume ya aru kwa-ubọchi, n'ile ihe na inu ihe): Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé; ma nke kachasi ndi nējeso anu-aru n'agu ihe emeruru emeru, ndi nēlelì kwa ibu-onye-nwe-madu anya. Ndi nwere anya-ike, ndi nwere isi-ike, ha amaghi aru jijiji ikwulu ndi nọ n'ebube: ebe ndi-mọ-ozi, ọ bu ezie na ha ka ha n'ume na ike, ma ha ekpegideghi ha ikpé nkwulu n'iru Onye-nwe-ayi.