II. NDI-EZE 6:15 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
II. NDI-EZE 6:15 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe onye na-ejere onye nke Chineke ozi biliri ọtọ nʼisi ụtụtụ pụọ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị agha na ịnyịnya na ụgbọala, ka ha gbara obodo ha nọ gburugburu. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m, gịnị ka anyị ga-eme ugbu a?”
Kesaa
II. NDI-EZE 6 BIUII. NDI-EZE 6:15 IGBOB (Bible Nso)
Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n'isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa?
Kesaa
II. NDI-EZE 6 IGBOB