II. NDI-EZE 6:1-7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
II. NDI-EZE 6:1-7 IGBOB (Bible Nso)
Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n'iru gi adikara ayi nkpa. Biko, ka ayi jerue Jọdan, si kwa n'ebe ahu were, nwoke ọ bula otù ntuhie, mere onwe-ayi otù ebe n'ebe ahu, ibiri n'ebe ahu. Ọ si, Jenu. Otù onye we si, Biko, kwere, soro ndi-orù-gi je. Ọ si, Mu onwem gēje. O we so ha je. Ha we biarue Jọdan, b͕utue osisi. O rue, mb͕e otù onye nēb͕utu ntuhie-ya, na anyu-ike dabàra na miri: o we tie nkpu, si, Ewó, onye-nwem! nke ahu bu ihe ariọtara ariọta. Onye nke Chineke we si, Òle ebe ọ dara? Ọ we me ka ọ hu ebe ahu. O we b͕utue otù osisi, tubà ya n'ebe ahu, me ka anyu-ike se n'elu miri. O si, Weliere onwe-gi. O we setia aka-ya, were ya.
II. NDI-EZE 6:1-7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụ ndị amụma gwara Ịlaisha okwu sị, “Lee, ebe a anyị bi nʼihu gị dị oke nta karịa. Ya mere, ka anyị gaa nʼakụkụ Jọdan gbute osisi anyị ga-eji wuo ụlọ ebe anyị ga-ebi.” Ọ sịrị ha, “Meenụ ka unu kwuru.” Ma otu onye nʼime ha rịọrọ ya sị, “Biko, nna anyị ukwu, soronụ anyị.” O kwenyere na ọ ga-eso ha. O sonyekwara ha. Mgbe ha bịaruru nʼakụkụ Jọdan, ha malitere igbutu osisi. Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta.” Mgbe ahụ, onye nke Chineke jụrụ ya sị, “Ebee ka ọ dabara?” Mgbe o ziri ya ebe ọ dabara, Ịlaisha gbutere osisi tụba ya nʼebe ahụ, mee ka anyụike ahụ segolite na-erugharị nʼelu mmiri. Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya.