Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 5:1 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

II. NDI-EZE 5:1 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Nʼoge a, Neeman bụ ọchịagha ndị agha eze Aram, Ọ bụ onye dị ukwuu nʼanya nna ya ukwu, bụrụkwa onye a na-enye nsọpụrụ nʼihi na ONYENWE ANYị sitere nʼaka ya nye ndị agha Aram mmeri nʼọgbọ agha dị iche iche. Ọ bụ dike na dimkpa nʼagha, maọbụ onye ekpenta.

II. NDI-EZE 5:1 IGBOB (Bible Nso)

Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n'iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n'ihi na ọ bu n'aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta.