II. NDI-EZE 4:1 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
II. NDI-EZE 4:1 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu ONYENWE ANYị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.”
Kesaa
II. NDI-EZE 4 BIUII. NDI-EZE 4:1 IGBOB (Bible Nso)
Ma otù nwayi n'etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n'onwe-ya umum abua ka ha buru orù.
Kesaa
II. NDI-EZE 4 IGBOB