Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 23:25 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

II. NDI-EZE 23:25 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ọ dịghị eze ọzọ nʼime ndị niile buru ya ụzọ chịa nke dịka Josaya, onye chigharịkwutere ONYENWE ANYị. Onye ji obi ya niile, na mmụọ ya niile na ike ya niile debe iwu niile e nyere Mosis. Ọ dịkwaghị eze ọzọ dịka ya, onye biliri mgbe ọ nwụsịrị.

II. NDI-EZE 23:25 IGBOB (Bible Nso)

Ọ dighi eze nke buru ya uzọ di ka ya, onye were obi-ya nile, were kwa nkpuru-obi-ya nile, were kwa ike-ya nile, chigharikute Jehova, dika iwu nke Moses si di; ọ dighi kwa onye ọzọ dika ya biliri mb͕e ọ nwusiri.