II. NDI-EZE 22:20 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
II. NDI-EZE 22:20 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a.’ ” Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.
Kesaa
II. NDI-EZE 22 BIUII. NDI-EZE 22:20 IGBOB (Bible Nso)
N'ihi ya, le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a. Ha we weghachiri eze okwu.
Kesaa
II. NDI-EZE 22 IGBOB