Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 20:5 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

II. NDI-EZE 20:5 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka ONYENWE ANYị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị.

II. NDI-EZE 20:5 IGBOB (Bible Nso)

Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova.