Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 2:1-13

II. NDI-EZE 2:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O ruo mgbe ONYENWE ANYị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal. Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na ONYENWE ANYị ziri m ozi ka m gaa Betel.” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka ONYENWE ANYị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel. Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na ONYENWE ANYị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?” Ịlaisha sịrị, “Mụ onwe m maara, ma unu nọrọ nwayọọ.” Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na ONYENWE ANYị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.” Ma ọ zara, “Dịka ONYENWE ANYị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere ha abụọ sokwaara ruo Jeriko. Ndị otu ndị amụma nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaisha nso jụọ ya, “Ị maara na ONYENWE ANYị ga-ewepụ onyenwe gị taa?” Ọ zara, “E, amaara m, ya mere nọọnụ nwayọọ.” Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na ONYENWE ANYị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka ONYENWE ANYị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje. Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan. Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ. Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.” Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.” Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe. Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ. Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan.

II. NDI-EZE 2:1-13 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e Jehova gaje ime ka Elaija rigorue elu-igwe n'oké ifufe, na Elaija siri na Gilgal je, ya na Elaisha. Elaija we si Elaisha, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Bet-el, Elaisha we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we ridarue Bet-el. Umu ndi-amuma ndi nọ na Bet-el we pukute Elaisha, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti. Elaija we si ya, Elaisha, biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Jeriko. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we biarue Jeriko. Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biarue Elaisha nso, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti. Elaija we si ya, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Jọdan. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha abua we je. Ọgu ndikom abua na iri n'etiti umu ndi-amuma je-kwa-ra, guzo na ncherita-iru ha n'ebe di anya: ha abua we guzo n'akuku Jọdan. Elaija we chiri uwe - nwuda - ya, piakọta ya, tie miri ahu, ewe kera ya, otù uzọ ga n'otù akuku, otù uzọ ga n'akuku ọzọ, ha abua we gabiga n'ala-akọrọ. O rue, mb͕e ha gabigasiri, na Elaija siri Elaisha, Riọ ihe m'gēmere gi, tutu ewepum n'ebe i nọ. Elaisha we si, Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim. Ọ si, I riọwo ihe siri ike: ma ọ buru na i hum mb͕e anēwepum n'ebe i nọ, ọ gādiri gi otú a; ma ọ buru na i hughm, ọ gaghi-adi otú a. O rue na, mb͕e ha nọ nēje, nēje ije nēkwu kwa okwu, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nke kewara ha abua; Elaija we rigorue elu-igwe n'oké ifufe. Ma Elaisha nēle ya anya; ya onwe-ya nēti kwa nkpu, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya! ma ọ hughi ya ọzọ: o we jide uwe nke aka ya, dọwa ha ibe abua. Ọ chili kwa uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, ọ laghachi, guzo n'usọ Jọdan.