II. NDI-EZE 13:21 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
II. NDI-EZE 13:21 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ.
Kesaa
II. NDI-EZE 13 BIUII. NDI-EZE 13:21 IGBOB (Bible Nso)
O rue, mb͕e ha nēli otù nwoke, le, ha huru usu ndi nāpunara madu ihe; ha we tubà nwoke ahu n'ílì Elaisha: nwoke ahu we da, metu ọkpukpu Elaisha aru, we di ndu, bilie guzo n'ukwu-ya abua.
Kesaa
II. NDI-EZE 13 IGBOB