II. NDI KỌRINT 3:12-18
II. NDI KỌRINT 3:12-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla. Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe. Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ. Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha. Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya. Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.
II. NDI KỌRINT 3:12-18 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere ebe ayi nwere olile-anya di otú a, ayi nēkwuwa okwu nke-uku, ayi adighi kwa ka Moses, onye nēkpudo ihe-nkpudo n'iru-ya, ka umu Israel we ghara ilegide anya rue ọgwugwu ihe ahu anēme ka ọ ghara idi irè: ma emere ka uche-ha ma etili: n'ihi na rue ubọchi ta n'ọgugu ọb͕ub͕a-ndu ochie otù ihe-nkpudo ahu nādigide, ebe anēkpugheghi na anēme ya ka ọ ghara idi irè nime Kraist. Ma rue ubọchi ta, mb͕e ọ bula anāgu akwukwọ Moses, ihe-nkpudo nādigide n'obi-ha. Ma mb͕e ọ bula o gēchigharikute Onye-nwe-ayi, ewepu ihe-nkpudo ahu. Ma Onye-nwe-ayi bu Mọ ahu: ma ebe Mọ nke Onye-nwe-ayi nọ, n'ebe ahu ka madu nwere onwe-ha. Ma ayi onwe-ayi nile ebe ayi were iru nke ekpupuworo ihe-nkpudo nēgosi ebube nke Onye-nwe-ayi dika enyo, anēnwogha ayi rue n'otù onyinyo ahu site n'ebube rue ebube, ọbuná dika anēnye ya site n'Onye-nwe-ayi, bú Mọ Nsọ.