Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI KỌRINT 12:1-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

II. NDI KỌRINT 12:1-4 IGBOB (Bible Nso)

Aghaghi m inya isi, ọ bu ezie na ọ baghi urù; ma m'gēche iru n'ọhù na ihe-nkpughe nke Onye-nwe-ayi. Amataram otù madu nime Kraist, arọ iri na anọ gara aga (ma ọ bu nime aru, amataghi m; ma-ọbu na ọ bughi nime aru, amataghm; Chineke matara), na eweliri madu di otú a na mberede rue elu-igwe nke-atọ. Amata-kwa-ram madu di otú a (ma ọ bu nime aru, ma-ọbu na aru anọghi ya, amataghi m; Chineke matara), na eweliri ya rigo na Paradais na mberede, o we nu okwu nke anāpughi ikwu, nke o nēzighi ezi n'iwu ka madu kwue ha.

II. NDI KỌRINT 12:1-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Aghaghị m ịnya isi, ọ bụ ezie na ọ baghị uru, ugbu a ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe niile Onyenwe anyị kpughere gosi m. Amaara m otu nwoke nọ nʼime Kraịst, onye e duuru gaa nʼeluigwe nke atọ ihe dị ka afọ iri na anọ gara aga, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke ma. Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya.