II. NDI KỌRINT 11:4-5 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
II. NDI KỌRINT 11:4-5 IGBOB (Bible Nso)
N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma. N'ihi na anamagu na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi.
II. NDI KỌRINT 11:4-5 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara. Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma.