II. IHE EMERE 18:1-34
II. IHE EMERE 18:1-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha. Ehab eze Izrel jụrụ Jehoshafat eze Juda, sị, “Ị ga-eso m buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị nke m bụkwa ndị gị. Anyị ga-eso gị gaa agha.” Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ntụziaka ONYENWE ANYị.” Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma dị narị ndị ikom anọ nʼọnụọgụgụ jụọ ha, sị, “Anyị a ga-ebuso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ha zara, “Gaa, nʼihi na Chineke ga-enyefe ha nʼaka eze.” Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma ONYENWE ANYị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?” Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ ONYENWE ANYị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.” Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.” Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha. Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYị na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ” Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na ONYENWE ANYị ga-enyefe ya nʼaka eze.” Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.” Ma Maikaya sịrị, “Dịka ONYENWE ANYị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.” Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.” Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha ONYENWE ANYị?” Mgbe ahụ, Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ma ONYENWE ANYị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu, ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ” Eze Izrel sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?” Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYị: Ahụrụ m ONYENWE ANYị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya. Ma ONYENWE ANYị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ. Nʼikpeazụ, otu mmụọ pụtara guzo nʼihu ONYENWE ANYị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ “ONYENWE ANYị jụrụ ya sị, ‘Olee otu ị ga-esi mee nke a?’ “Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’ “ONYENWE ANYị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’ “Ma ugbu a, ONYENWE ANYị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. ONYENWE ANYị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.” Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na ONYENWE ANYị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?” Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.” Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze. Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ” Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị ONYENWE ANYị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.” Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead. Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha. Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.” Mgbe ndị ọchịagha na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya, ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, nke mere na ONYENWE ANYị nyeere ya aka. Chineke wezugara ha site nʼebe ọ nọ, nʼihi na mgbe ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụso ya. Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ ihe ikpuchi obi na uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m nʼihi na emerụọla m ahụ.” Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile. Eze Izrel guzobere onwe ya ka ọ kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu ruo uhuruchi. Ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.
II. IHE EMERE 18:1-34 Bible Nso (IGBOB)
Jehoshafat we nwe àkù na nsọpuru n'uba; o we ghọ ọgọ Ehab. Mb͕e arọ ufọdu gwusiri ọ ridakuru Ehab, rue Sameria. Ehab we b͕uere ya aturu na ehi n'uba, b͕u-kwa-ra ndi ya na ha yikọrọ, o we kpalie ya irigoru Remot-gilead. Ehab, bú eze Israel, we si Jehoshafat, bú eze Juda, Ì gēsom je Remot-gilead? Ọ we si ya, Dika m'di, otú a ka i di, ndim di kwa ka ndi-gi; ayi gānọye-kwa-ra gi n'agha ahu. Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzọ ju ase okwu Jehova. Eze Israel we chikọta ndi-amuma, bú nnù ndikom, si ha, Àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ha we si, Rigo; Chineke gēnye kwa ya n'aka eze. Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n'ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n'aka-ya? Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ ubọchi-ya nile: onye ahu bu Maikaia nwa Imla. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a. Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ. Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, ha we nọdu n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha. Zedakaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia. Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n'aka eze. Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di kwa ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe. Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Chinekem gāsi, nke ahu ka m'gēkwu. O we biakute eze, eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ọ si, Rigonu, ka ihe ga-kwa-ra unu nke-ọma; agēnye kwa ha n'aka-unu. Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova? Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo. Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ? Ọ si, N'ihi nka nurunu okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya. Jehova we si. Ònye gārafu Ehab, bú eze Israel, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Otù onye nke nēkwu okwu we si otú a, onye ọzọ nke nēkwu okwu si kwa otú a. Mọ ahu we puta, guzo n'iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya. Jehova we si ya, Gini ka i gēji? Ọ si, M'gāpu, buru mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a. Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi. Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu? Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi. Eze Israel we si, Kurunu Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze, unu gāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n'ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m'gālaghachi n'udo. Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n'udo, Jehova ekwughi okwu n'ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n'uwa, unu nile. Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead. Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya; ha we ba n'agha. Ma eze Siria nyere ndi-isi ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya. O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n'ebe ọ nọ pua. O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ọ bughi eze Israel, ha we si n'iso ya laghachi. Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam. Agha we la elu n'ubọchi ahu: eze Israel we guzogide onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya imegide Siria rue anyasi: ọ we nwua mb͕e anyanwu nāda.