Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. TIMỌTI 3:1-10 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

I. TIMỌTI 3:1-10 IGBOB (Bible Nso)

Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, Ọ buru na onye ọ bula nāb͕aso ọnọdu onye nēlekọta nzukọ Kraist anya, agu ọlu ọma nāgu ya. Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe; onye nādighi-ese okwu site n'iṅubiga manya ókè, onye nādighi-eti madu aka; kama onye nwere obi-ọma, onye nādighi-alu ọ̀gù, onye nādighi-ahu ego n'anya; onye nāchi èzí-na-ulo nke aka ya nke-ọma, nēnwe kwa umu-ya n'okpuru ya n'ikwesi-nsọpuru nile; (ma ọ buru na onye ọ bula amataghi otú ọ gāchi èzí-na-ulo nke aka ya, ò gēsi aṅa le nzukọ Chineke anya nke-ọma?) onye nābughi onye ọhu, ka aghara ifuli ya elu, o we dabà n'ọmuma-ikpé ekwensu. Ma ọ ghaghi kwa inwe àmà di nma site n'ọnu ndi nọ n'èzí; ka ọ ghara idabà n'ita-uta, ya na ima n'ọnyà ekwensu. Otú ahu ndi nējere nzukọ Kraist ozi aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nēnweghi ire abua, ndi nādighi-aṅubiga manya ókè, ndi akpiri urù nke nēweta ihere nādighi-akpọ ha nku; ndi nēnwe ihe-omimi nke okwukwe-ayi nime akọ-na-uche di ọcha. Ma ka eburu uzọ nwa kwa ndia; mb͕e ahu ka ha jebe ozi, ma ọ buru na ha bu ndi anāpughi ibo ebubo.

I. TIMỌTI 3:1-10 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi ma bụrụkwa eziokwu, bụ nke na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ọnọdụ ịbụ ụkọchukwu, ọ na-achọ ezi ọrụ kacha mma. Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya. Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla. (Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?) Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu. Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu. Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ, ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi. Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike. Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.