I. TIMỌTI 1:5-11
I. TIMỌTI 1:5-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe anyị bu nʼobi nye iwu a, bụ ka a kwalite ịhụnanya nke sitere nʼobi ọcha na ezi akọnuche, na okwukwe nke aghụghọ na-adịghị. Ụfọdụ e sikwala nʼihe ndị a dapụ, jehie ụzọ, site nʼoke ịrụ ụka na-abaghị uru. Ha chọrọ ịbụ ndị ozizi iwu ma ha amaghị ihe ha na-ekwu maọbụ ihe ha na-akwadosi ike. Ma anyị maara na iwu dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ya mee ihe a chọrọ ka e jiri ya mee. Ma emeghị iwu nʼihi ndị ezi omume. Kama, e mere iwu nʼihi ndị ahụ na-emebi iwu na ndị na-enupu isi, ndị kpọrọ Chineke asị na ndị mmehie, ndị rụrụ arụ, ndị na-egbu nna ha na nne ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha, na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ, nke dabara nʼoziọma ahụ dị ebube, nke Chineke dị ngọzị, nke o nyefere m nʼaka na ntụkwasị obi ichebe.
I. TIMỌTI 1:5-11 Bible Nso (IGBOB)
Ma ihe ezubere iweta n'iwu ahu bu ihu-n'anya sitere n'obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya: nke madu ufọdu, ebe ha hiere ha, ha siri nime ha jehie we kwue okwu efu; chọ kwa ibu ndi-ozizí nke iwu, ọ bu ezie na ha aghọtaghi ihe ha nēkwu, ha aghọtaghi kwa ihe ahu ha nēkwusi ike bayere ha. Ma ayi matara na iwu ahu di nma, ma ọ buru na onye ọ bula ewere ya me ihe n'uzọ kwesiri iwu, ebe ọ matara nka, na adighi-enye onye ezi omume iwu, kama anēnye ndi nēmebi iwu, ndi nēkweghi kwa idi n'okpuru iwu, nye ndi nāsọpurughi Chineke, ndi bu kwa ndi-nmehie, nye ndi nādighi ọcha n'obi, ndi emeru-kwa-ra emeru, nye ndi nēb͕u nna-ha na ndi nēb͕u nne-ha, nye ndi nēb͕u madu, nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; dika ozi ọma nke ebube nke Chineke di ngọzi si di, nke enyere mu onwem n'aka na ntukwasi-obi idebe.