Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI TESALỌNAIKA 3:6-13 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

I. NDI TESALỌNAIKA 3:6-13 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya. Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu. Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị. Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu. Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu. Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu. Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ. Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.

I. NDI TESALỌNAIKA 3:6-13 IGBOB (Bible Nso)

Ma mb͕e Timọti siri n'ebe unu nọ biakute ayi ọbuná ub͕u a, we zìe ayi ozi ọma bayere okwukwe na ihunanya unu, si kwa na unu nēcheta ayi ezi ncheta mb͕e nile, na agu ihu ayi anya nāgusi kwa unu ike, ọbuná dika ọ nāgu kwa ayi onwe-ayi ihu unu; n'ihi nka, umu-nna-ayi, akasiri ayi obi n'ihi unu nime nkpà-ayi nile na nkpab͕u-ayi nile site n'okwukwe-unu: n'ihi na ayi di ndu ub͕u a, ọ buru na unu onwe-unu nēguzosi ike nime Onye-nwe-ayi. N'ihi na ekele gini ka ayi puru inyeghachi Chineke bayere unu, n'ọṅù nile ayi ji ṅuria n'ihi unu n'iru Chineke-ayi; abali na ehihie nāriọbiga aririọ ókè nke-uku ri nne ka ayi we hu iru-unu, dochi kwa ihe fọduru n'okwukwe-unu? Ma ka Ya onwe-ya, bú Chineke-ayi na Nna-ayi, Onye-nwe-ayi Jisus, duzi uzọ-ayi rue ebe unu nọ: ka Onye-nwe-ayi me kwa ka unu rie nne babiga kwa ókè n'ihunanya n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ, ọbuná dika ayi onwe-ayi di n'ebe unu nọ; ka O we me ka obi-unu guzosie ike nādighi ita uta n'idi-nsọ n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus, Ya na ndi nsọ Ya nile.