Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI TESALỌNAIKA 3:1-13

I. NDI TESALỌNAIKA 3:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, mgbe anyị na-apụghị ịnagide ya gaa nʼihu, anyị kpebiri ịnọ naanị anyị nʼAtens. Anyị zipụrụ Timoti, onye bụ nwanna anyị, onye anyị na ya so na-arụrụ Chineke ọrụ site nʼịkwusa oziọma Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasịe unu obi, meekwa ka unu guzosie ike nʼokwukwe unu. Ka unu hapụ ịda mba nʼihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nke a ga-abụ ihe nketa anyị. Nʼihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a, ihe niile emezuola dị ka unu matakwara. Nʼihi nke a, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, eziri m ozi, ka a chọpụta maka okwukwe unu. Nʼihi na ụjọ m bụ ma eleghị anya o nweela ụzọ onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ si nwaa unu ọnwụnwa nʼoge a, mee ka ndọgbu niile anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ nʼetiti unu bụrụ ihe lara nʼiyi. Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya. Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu. Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị. Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu. Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu. Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu. Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ. Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.

I. NDI TESALỌNAIKA 3:1-13 Bible Nso (IGBOB)

N'ihi nka mb͕e ayi nāpughi inagide ọzọ, ọ di ayi ezi nma ka arapu nání ayi n'azu n'Atens; ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n'ozi ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka o we kasi kwa unu obi n'ihi okwukwe-unu; ka ewe ghara ikwaghari onye ọ bula nime nkpab͕u ndia; n'ihi na unu onwe-unu matara na ọ bu n'ihi nka ka edoro ayi. N'ihi na n'ezie, mb͕e ayi nọ n'etiti unu, ayi buru uzọ nāgwa unu na agaje ikpab͕u ayi; ọbuná dika o mere, dika unu matakwara. N'ihi nka mu onwem kwa, mb͕e m'nāpughi idi nānagide ya ọzọ, eziterem ka m'mara okwukwe-unu, ma o nwere uzọ ọ bula onye-ọnwunwa ahu nwarari unu, ndọb͕u ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu we ghọ ihe-efu. Ma mb͕e Timọti siri n'ebe unu nọ biakute ayi ọbuná ub͕u a, we zìe ayi ozi ọma bayere okwukwe na ihunanya unu, si kwa na unu nēcheta ayi ezi ncheta mb͕e nile, na agu ihu ayi anya nāgusi kwa unu ike, ọbuná dika ọ nāgu kwa ayi onwe-ayi ihu unu; n'ihi nka, umu-nna-ayi, akasiri ayi obi n'ihi unu nime nkpà-ayi nile na nkpab͕u-ayi nile site n'okwukwe-unu: n'ihi na ayi di ndu ub͕u a, ọ buru na unu onwe-unu nēguzosi ike nime Onye-nwe-ayi. N'ihi na ekele gini ka ayi puru inyeghachi Chineke bayere unu, n'ọṅù nile ayi ji ṅuria n'ihi unu n'iru Chineke-ayi; abali na ehihie nāriọbiga aririọ ókè nke-uku ri nne ka ayi we hu iru-unu, dochi kwa ihe fọduru n'okwukwe-unu? Ma ka Ya onwe-ya, bú Chineke-ayi na Nna-ayi, Onye-nwe-ayi Jisus, duzi uzọ-ayi rue ebe unu nọ: ka Onye-nwe-ayi me kwa ka unu rie nne babiga kwa ókè n'ihunanya n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ, ọbuná dika ayi onwe-ayi di n'ebe unu nọ; ka O we me ka obi-unu guzosie ike nādighi ita uta n'idi-nsọ n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus, Ya na ndi nsọ Ya nile.