Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 9:15-17 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

I. SAMUEL 9:15-17 IGBOB (Bible Nso)

Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si, Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti. Mb͕e Samuel huru Sọl, Jehova we za ya, si, Le nwoke ahu onye M'siri gi te manu! onye a gēb͕ochi ndim n'ime ihe ọjọ.

I. SAMUEL 9:15-17 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma nʼụbọchị bọrọ tupu ụbọchị Sọl na-abịa, ONYENWE ANYị kpughere nke a nye Samuel. “Dịka mgbe a echi, aga m ezitere gị otu nwoke sị nʼala Benjamin. Ị ga-ete ya mmanụ nke ga-eme ya ka ọ bụrụ onyendu Izrel ndị m. Ọ ga-azọpụta ha site nʼaka ndị Filistia, nʼihi na ahụla m ahụhụ nke ha nọ nʼime ya; anụkwala m ịkwa akwa ha.” Mgbe Samuel hụrụ Sọl, ONYENWE ANYị gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m gwara gị ihe banyere ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị m.”