I. SAMUEL 16:1-23
I. SAMUEL 16:1-23 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom. Samuel we si, M'gēsi aṅa je? ọ buru na Sọl anu ya, ọ gēb͕um. Jehova we si, I gēwere nwa-ab͕ọghọ-ehi n'aka-gi, si, Ichuru Jehova àjà ka m'biaworo. I gākpọ kwa Jesi ibia n'ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M'gāsi gi te. Samuel we me ihe ahu nke Jehova kwuru, ọ biarue Bet-lehem. Ndi-okenye obodo ahu we ma jijiji izute ya, si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo? Ọ we si, Ọ bu n'udo: ichuru Jehova àjà ka m'biaworo: donu onwe-unu nsọ, sorom bia n'ichu-àjà ahu. O we do Jesi na umu-ya ndikom nsọ, kpọ ha bia n'ichu-aja ahu. O rue, mb͕e ha biara, na ọ huru Elaiab, o we si, N'ezie, ọ nọ n'iru Jehova, bú onye nke Ya etere manu. Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi. Jesi we kpọ Abinadab, me ka ọ gābiga n'iru Samuel. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. Jesi we me ka Shama gabiga. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. Jesi we me ka madu asa nime umu-ya ndikom gabiga n'iru Samuel. Samuel we si Jesi, Jehova arọputaghi ndia. Samuel we si Jesi, Hà agwuwo, bú umu-okoro-gi? Ọ si, Ọ fọdu-kwa-ra ọdudù-nwam, ma, le, ọ nāzù aturu. Samuel we si Jesi, Ziga kuta ya: n'ihi na ayi agaghi-anọdu buruburu rue mb͕e ọ biara n'ebe a. Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya. Samuel we were mpi manu ahu, te ya n'etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n'ike site n'ubọchi ahu ga n'iru. Samuel we bilie, la Rema. Ma Mọ nke Jehova wezugara Onwe-ya n'ebe Sọl nọ, mọ ọjọ we si n'ebe Jehova nọ me ka ọ tua egwu nke-uku. Ndi-orù Sọl we si ya, Biko, le, mọ ọjọ nke Chineke nēme ka i tua egwu. Biko, ka onye-nwe-ayi si ndi-orù-ya, ndi nọ n'iru gi, ka ha chọ nwoke nke mara ọkpukpọ-ubọ-akwara nke-ọma: ọ gēru kwa, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke dikwasi n'aru gi, na ọ gēwere aka-ya kpọ ubọ, ọ gādi kwa gi nma. Sọl we si ndi-orù-ya, Biko, hutaranum nwoke nke nākpọ ubọ nke-ọma, me-kwa-nu ka ọ biakutem. Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya. Sọl we zigara Jesi ndi-ozi, si, Ziterem Devid nwa-gi, nke nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu. Jesi we were otù inyinya-ibu nke eboro ya achicha, na otù karama-akpukpọ manya-vine, na otù nwa-ewu, we zigara Sọl n'aka Devid, bú nwa-ya. Devid we biakute Sọl, guzo n'iru ya: o we hu ya n'anya nke-uku; o we ghọrọ ya onye nēbu ihe-agha. Sọl we zigara Jesi ozi, si, Biko, ka Devid guzo n'irum; n'ihi na ọ hutawo amara n'irum. O rue, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke di n'aru Sọl, na Devid were ubọ-akwara-ya, were aka-ya kpọ ya: aru we dajua Sọl, o we di ya nma, mọ ọjọ ahu we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.
I. SAMUEL 16:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Emesịa ONYENWE ANYị sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.” Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” ONYENWE ANYị sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ ONYENWE ANYị aja.’ Ị ga-akpọ Jesi ka ọ bịa soro nʼọchụchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, aga m egosi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etekwara m ya mmanụ, bụ onye m nke ga-egosi gị.” Samuel mere ihe ONYENWE ANYị kwuru. Mgbe o rutere na Betlehem, ndị okenye obodo ahụ ji ịma jijiji pụta izute ya. Ha jụrụ ya sị “Ọ dịkwa mma? Udo ọ dịkwa?” Ma Samuel zara ha sị “E, udo dị, Abịara m ịchụrụ ONYENWE ANYị aja. Doonụ onwe unu nsọ bịa soro m gaa ịchụ aja ahụ.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị ikom nsọ, gwakwa ha ka ha soro gaa. Mgbe ha ruru, Samuel hụrụ Eliab kwuo nʼobi ya sị, “Nʼezie, onye nke ONYENWE ANYị tere mmanụ na-eguzo nʼihu ONYENWE ANYị.” Ma ONYENWE ANYị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. ONYENWE ANYị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma ONYENWE ANYị na-ele anya nʼobi.” Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “ONYENWE ANYị ahọrọghị onye a.” Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba ONYENWE ANYị ahọrọghị onye a.” Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “ONYENWE ANYị ahọrọghị ndị a.” Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?” Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.” Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.” Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.” Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ ONYENWE ANYị bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema. Ugbu a, Mmụọ ONYENWE ANYị esitela nʼime Sọl pụọ, ONYENWE ANYị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl. Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu. Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.” Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.” Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. ONYENWE ANYị nọnyekwara ya.” Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.” Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl. Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl. Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.” Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.