I. SAMUEL 14:1-3
I. SAMUEL 14:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu ụbọchị, Jonatan nwa Sọl, kpọrọ nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ndagwurugwu jeruo nʼụlọ ikwu ndị Filistia.” Ma ọ gwaghị Sọl nna ya. Sọl na narị ndị ikom isii ya na-anọdụ nʼebe dị anya site na Gibea, nʼokpuru osisi pomegranet dị na Migrọn. Otu nʼime ndị so Sọl bụ Ahija onye nchụaja, onye yi efọọd. Ọ bụ nwa Ahitub, onye bụ nwanne Ịkabọdụ. Ahitub bụ nwa nwa Finehaz, onye bụ nwa Elayị, onye nchụaja ONYENWE ANYị na Shaịlo. Ọ dịkwaghị onye ma na Jonatan apụọla.
I. SAMUEL 14:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ubọchi we rue mb͕e Jonatan nwa Sọl siri nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, nke di n'ofè ọzọ ahu. Ma o gosighi nna-ya. Ma Sọl nānọdu na nsọtu Gibea n'okpuru osisi pomegranate nke di na Migron: ndi nọ n'aka-ya ra ka nnù ndikom na ọgu iri; Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo.