Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 13:14 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

I. SAMUEL 13:14 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. ONYENWE ANYị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe ONYENWE ANYị nyere gị nʼiwu.”

I. SAMUEL 13:14 IGBOB (Bible Nso)

Ma ub͕u a ala-eze-gi agaghi-eguzosi ike: Jehova achọputaworo Onwe-ya otù nwoke dika obi-Ya si chọ, Jehova enyewo kwa ya iwu ibu onye-ndú ndi-Ya, n'ihi na i debeghi ihe ahu nke Jehova nyere gi n'iwu.