I. NDI-EZE 3:7-14
I. NDI-EZE 3:7-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ugbu a, ONYENWE ANYị bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa. Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke. Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?” Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a. Ya mere, Chineke zara sị ya, “Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị. Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị. Ọzọkwa, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị na-arịọghị m, akụnụba, na nsọpụrụ, ka ọ ga-abụ nʼụbọchị niile nke ndụ gị, ị gaghị enwe onye ọbụla ga-adị ka gị nʼetiti ndị eze niile. Ọ bụrụkwa na i jee ije nʼụzọ m niile, debe iwu m, meekwa ihe m gwara gị, dịka nna gị Devid mere, aga m enye gị ogologo ndụ.”
I. NDI-EZE 3:7-14 Bible Nso (IGBOB)
Ma ub͕u a, Jehova, bú Chinekem, Gi onwe-gi emewo orù-Gi eze n'ọnọdu Devid, bú nnam: ma mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata. Orù-Gi nọ kwa n'etiti ndi-Gi I rọputaworo, ndi bara uba, ndi anādighi-aguta ha, ndi anādighi-agu kwa ha ọnu, n'ihi iba-uba-ha. Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe? Okwu-ya we di nma n'anya Onye-nwe-ayi, na Solomon riọrọ ihe a. Chineke we si ya, N'ihi na i riọrọ ihe a, ma i riọghi nye onwe-gi ọtutu ubọchi; i riọghi kwa àkù nye onwe-gi, i riọghi kwa ndu ndi-iro-gi; kama i riọworo onwe-gi nghọta inu ikpé; le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi. Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n'etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile. Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.