Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 2:2-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

I. NDI-EZE 2:2-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Oge ọnwụ m eruola,” ka ọ sịrị, “Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke. Debe iwu niile ONYENWE ANYị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị. Ka ONYENWE ANYị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’

I. NDI-EZE 2:2-4 IGBOB (Bible Nso)

Mu onwem nēje n'uzọ uwa nile: ma di ike, buru kwa nwoke; debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, bú Chineke-gi, ije n'uzọ-Ya nile, idebe ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-ya nile, na ihe-àmà-Ya nile, dika ihe edere n'iwu Moses si di, ka i we nwe uche n'ihe ọ bula nke i nēme, na n'ebe ọ bula i nēche iru-gi: ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike nke O kwuru bayerem, si, Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n'irum n'ezi-okwu n'obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agaghi-ebipu n'ulo-gi onye nwe inọdu n'oche-eze Israel, ka O kwuru.