Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 19:11 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

I. NDI-EZE 19:11 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

ONYENWE ANYị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu ONYENWE ANYị, nʼihi na ONYENWE ANYị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu ONYENWE ANYị, ma ONYENWE ANYị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma ONYENWE ANYị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ.

I. NDI-EZE 19:11 IGBOB (Bible Nso)

Ọ si, Pua, guzo n'ugwu n'iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n'iru Jehova; ma Jehova anọghi n'ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n'ala-ọma-jijiji ahu